fadabarto chidozie şarkı sözleri

Dozie! Dozie! Chidozie! Chukwudozie, Chukwu nọ n'Oriri Nsọ Ka Ahụ na Ọbara Gị m na-anata Gbanwoo mo! Sachaa mo! Ka Ahụ na Ọbara Gị m na-anata Doo m nsọ O Onyendozi! Ka Ahụ na Ọbara Gị m na-anata Doo m nsọ O Onyendozi! Ike agwụgo mo! Ike agwụgo mo! Ike agwụgo mo, imejọzi Gị Jesu mo! Werenụ amara Gị jidesienụ m ike Dozie ndụ m, ka m bụrụ nke Gị o! Chukwu Dozie! Dozie! Chidozie! Chukwudozie, Chukwu nọ n'Oriri Nsọ Ka Ahụ na Ọbara Gị m na-anata Gbanwoo mo! Sachaa mo! Ka Ahụ na Ọbara Gị m na-anata Doo m nsọ O Onyendozi! Ka Ahụ na Ọbara Gị m na-anata Doo m nsọ O Onyendozi! O teela m chọbara ka m na Gị dozie Ma ụtọ njọ ekweghi m ka m kwụdosie ike Nyerenụ m aka ka m mebe uche Gị Belatara m oliwarawara, oliwarawara nke njọ Chukwu Dozie! Dozie! Chidozie! Chukwudozie, Chukwu nọ n'Oriri Nsọ Ka Ahụ na Ọbara Gị m na-anata Gbanwoo mo! Sachaa mo! Ka Ahụ na Ọbara Gị m na-anata Doo m nsọ O Onyendozi! Ka Ahụ na Ọbara Gị m na-anata Doo m nsọ O Onyendozi! Mgbe ebili mmiri nke ụwa na-efegharị m Mgbe ọnwụnwa nke ụwa na-atụgharị m Jidesienụ m ike! Jidesienụ m ike! Ka m ghara ịda Chukwu na-edozi ihe niile! Chukwu Dozie! Dozie! Chidozie! Chukwudozie, Chukwu nọ n'Oriri Nsọ Ka Ahụ na Ọbara Gị m na-anata Gbanwoo mo! Sachaa mo! Ka Ahụ na Ọbara Gị m na-anata Doo m nsọ O Onyendozi! Ka Ahụ na Ọbara Gị m na-anata Doo m nsọ O Onyendozi! Dozienụ mo, O Onyendozi! Dozienụ mo, O Onyendozi! Dozie mo! Dozie! Chukwu dozie; mee m ka m mara Gị Olisa dozie ife na-esere anyị o! Dozienụ ndụ mo! Nyenụ m ndụ ohuru! Dozienụ ndụ mo! Onye I doziri, o nwee mgbanwe O kwa Gị doziri ndụ Meri Magdalịn? O kwa Gị doziri ndụ nwanyị oruru ọbara? Zakịọs zutere Gị; I nye ya nzọpụta Sọl zutere Gi; I gbanweere ya aha Nwanyị Sameria zutere Gị o! I gbanweere ya ọnọdụ Lezianụ mo, Chimo! Lezianụ mo, Chimo! Dozienụ mo, O Onyendozi! Dozienụ mo, O Onyendozi!
Sanatçı: FadaBarto
Türü: Belirtilmemiş
Ajans/Yapımcı: Belirtilmemiş
Şarkı Süresi: 8:33
Toplam: kayıtlı şarkı sözü
FadaBarto hakkında bilgi girilmemiş.

Fotoğrafı