fadabarto n'aja missa di aso şarkı sözleri

Chukwu lekwa ndị Gị o! (lekwa anyị o, anyị abịa!) Anyị gbakọrọ n'ihu Gị o! (lekwa anyị o, Olisa bi n'igwe!) Inye gị ekele maka ọgọ Gị niile! (Chukwu mo!) Inye Gị otito na ofufe kwesịrị Gị Kọkwaara Gị mkpa anyị, yọọ Gị mgbaghara n'aja Missa (Chiọma mo!) K'anyị kọkwaara Gị mkpa anyị yọọ Gị mgbaghara n'aja Mịssa dị asọ! Anụrị juru m obi mgbe m nụrụ ka ha kwuru sị K'anyị jee n'ụlọ nsọ; n'ụlọ nsọ Chineke Chukwu eh lee mo! Abịara m n'ihu Gị! Inye gị ekele maka ọgọ Gị niile! (Chukwu mo!) Inye Gị otito na ofufe kwesịrị Gị Kọkwaara Gị mkpa anyị, yọọ Gị mgbaghara n'aja Missa (Chiọma mo!) K'anyị kọkwaara Gị mkpa anyị yọọ Gị mgbaghara n'aja Mịssa dị asọ! Ugo niile ebelụsịgo inye Gị ekele! Ụmụ nnụnụ nke igwe Anụ bi n'ọhịa, ọnwa na kpakpando na ihe niile I kere eke Anyị guzoro n'ihu Gị! Inye gị ekele maka ọgọ Gị niile! (Chukwu mo!) Inye Gị otito na ofufe kwesịrị Gị Kọkwaara Gị mkpa anyị, yọọ Gị mgbaghara n'aja Missa (Chiọma mo!) K'anyị kọkwaara Gị mkpa anyị yọọ Gị mgbaghara n'aja Mịssa dị asọ! Lee ka Ụlọobibi Gị siri makarịsịa mma N'ezie ha bụ ndị a gọziri agọzi Bụ ndị bi n'ụlọ Gị na-ekwere Gị ukwe otito oge niile, oh! Ọ ga-amasị m isoro ha kwebeere Gị ukwe ọñụ! Inye gị ekele maka ọgọ Gị niile! (Chukwu mo!) Inye Gị otito na ofufe kwesịrị Gị Kọkwaara Gị mkpa anyị, yọọ Gị mgbaghara n'aja Missa (Chiọma mo!) K'anyị kọkwaara Gị mkpa anyị yọọ Gị mgbaghara n'aja Mịssa dị asọ! Otu ụbọchị na be Gị ka mma Karịa nnụ kwuru nnụ afọ n'ebe ọzọ Chukwu eh, abịara m n'obi Gị! Inye gị ekele maka ọgọ Gị niile! (Chukwu mo!) Inye Gị otito na ofufe kwesịrị Gị Kọkwaara Gị mkpa anyị, yọọ Gị mgbaghara n'aja Missa (Chiọma mo!) K'anyị kọkwaara Gị mkpa anyị yọọ Gị mgbaghara n'aja Mịssa dị asọ!
Sanatçı: FadaBarto
Türü: Belirtilmemiş
Ajans/Yapımcı: Belirtilmemiş
Şarkı Süresi: 4:36
Toplam: kayıtlı şarkı sözü
FadaBarto hakkında bilgi girilmemiş.

Fotoğrafı