fadabarto omeokachie şarkı sözleri

Bịa soro nụ mo ken' Olisa Jaa Ya mma eh Soro mo! ken' Olisa Ọ bụ Omeokachie Soro m jawa Ya mma, Eh! Bịanụ soro m jawa Chukwu mma Aaeh! Ndị enyi m tụwara Ya mma mma Chi m emekwaala ya ọzọ Olisa emekwaala k'O si eme Omeiheukwu M kọwa mmeso ọma Ya na ndụ mo! Chi ga-eji chi ga-abọ Aga m eburu egwu m, yọrọ ịbara (ka m gbar' egwu ọyọrịma, egwu oyoko) Jee (were kelee Ya) ka m kelee ya maka ihe Ọ na-eme Ọ bụ Omeokachie Chi m nar'ekele nar'otito mo Nara m mbuli elu nar'ọjịja mma Ị bụ Omeokachie aeh! O Chukwu n'Ị bụ Omeọkachie! Bịanụ lele ihe Chukwu meere m aeh! Bịanụ lele ihe Chukwu meere m aeh! Ị makwa' ọ bụrụ mmadụ ọ gakwa ana m ego Ọ bụrụ mmadụ ọ ga-ana m omụrụnwa Mana Chi m anaghị ana m ego, Ọ na-enye m na nkịtị Ọ bụ nwa? ọ bụ ndụ? ọ bụ ego k' ọ bụ ahụike Ọganiihu, ijeawele, ọgụgụisi Ha bụ onyinye Chukwu Aga m eburu egwu m, yọrọ ịbara (ka m gbar' egwu ọyọrịma, egwu oyoko) Jee (were kelee Ya) ka m kelee ya maka ihe Ọ na-eme Ọ bụ Omeokachie Chi m nar'ekele nar'otito mo! Nara m mbuli elu nar'ọjịja mma Ị bụ Omeokachie aeh! O Chukwu n'Ị bụ Omeọkachie! Aga m'e-buru ekene mo! (bugara ya Omeọkachie!) oh! Aga m ebur'otito mo! (bugara ya Omeọkachie!) eh! Bugara ya Eze Jesus (Ọ bụ ya bụ) Onye na-eme mma (Ọ bụ ya bụ) Onye na-enye ndụ Odu m ije mo! (tobe) Onye na-agwo ọrịa Ikuku mbekumbe mo! Ọzọ gidigbam gidigbam gidigbam gidigbam gidigbam Nwanne ọṅụ na-egbuzi m ka mmanya, ihe Ọ na-eme! Aga m eburu egwu m, yọrọ ịbara (ka m gbar' egwu ọyọrịma, egwu oyoko) Jee (were kelee Ya) ka m kelee ya maka ihe Ọ na-eme Ọ bụ Omeokachie Chi m nar'ekele nar'otito mo! Nara m mbuli elu nar'ọjịja mma Ị bụ Omeokachie aeh! O Chukwu n'Ị bụ Omeọkachie! O Chukwu n' Ị bụ Omeọkachie-eee! O Chukwu n' Ị bụ Omeọkachie! O Chukwu n' Ị bụ Omeọkachie-eee! O Chukwu n' Ị bụ Omeọkachie! Omeọkachie! Onyeoma! Omeọkachie! Onyeoma! Omeọkachie! olu m ekelee Gị o! Omeọkachie! nar'otito mo! Omeọkachie! Ekwueme! Okaaoburuụzọ 1! Aga m'akọwa kọwa kọwa kọwa kọwa kọwa ihe Ị na-emere mo! Ka m nye Gị ekele nke si n'obi m Aga m eji egwu ọyọrima yọr' ịbara bịa ka m kelee Gị Maka ihe ọma I meere m N' Ị bụ Omeoọkachie! O Chukwu n'Ị bụ Omeọkachie! O Chukwu n'Ị bụ Omeọkachie! O Chukwu n'Ị bụ Omeokachie!
Sanatçı: FadaBarto
Türü: Belirtilmemiş
Ajans/Yapımcı: Belirtilmemiş
Şarkı Süresi: 5:02
Toplam: kayıtlı şarkı sözü
FadaBarto hakkında bilgi girilmemiş.

Fotoğrafı